Chọpụta Zaria, Kaduna
Zaria, amara na mbụ ka Zazzau , bụ obodo ukwu na Kaduna, steeti na obodo mpaghara ugwu nke Nigeria. Obodo a bu nke ndi bijuputara na ya kari bu ndi Hausa bu nke Emir na-achị. Obodo bụ na mbụ akụkụ nke asaa obodo Hausa. Ọ bụ obodo nke dabere na akụ ụba nke oru ubi na nke na emeputa akwa (textile), nke bu ugbu a ebe obibi nye ụlọ mahadum kachasi ukwuu na Nigeria, Ahmadu Bello University na ọtụtụ ulo akwukwo ndị ọzọ na Zaria ndi dị ka ulo akwukwo nke Nigeria ebe a na akuzi otu esi akwo ugboelu (Nigerian College of Aviation Technology) ulo akwukwo nke ndi agha na Nigeria (Nigeria Military School).
Otutu ebe mmasi
Ulo akwukwo mahadum Ahmadu Bello bụ ebe mara mma ime nleta, ọ bụ mahadum kachasi ukwuu na Nigeria , na nke abụọ kasị buo ibu na Africa oburu enwetacha ulo akwukwo mahadum Cairo nke Egypt. Mahadum nwere otutu ndi amama gara na ya. The 14 - 16km mgbidi obodo Zaria, nke gafere obodo ahụ bụ nke a na gaghi ihụ . Mgbidi a bụ otu n'ime ndị kasị adọrọ mmasị ncheta na obodo mpagahara ugwu nke Nigeria. Obí Eze nke Zazzau bu kwa ebe ọzọ nwekwara ihe ndoro mmasị amama, o nwere ihe omenala Habe mara mma esere-ese. Alaeze nke narị afọ iri na ise nke eze nwanyi onye agha (The kingdom of the 15th century warrior Queen), Amina nke Turunku , Zaria bụ ebe ọzọ di kwa nma nke ukwuu I ga njem nleta. akụkọ ya bu nke e ji mee Ihe nkiri Igwe onyonyo (TV) nke akporo Xena .
Họtelu ndi di na Zaria
Jerry Marriott Guest House bụ họtelu eji kpakpando ano mara na Zaria , nke di na GRA Zaria , ọ mara mma nke ukwuu ma buru kwa ebe di jụụ maka onunọ. E nwere họtelu ndị ọzọ nọ ogugo kpakpando ato na ano na Zaria, nwere onu ego ahịa di ala, bu ndi dị ka Naerls Suites and Conference Center, Marhaba Họtelu na Immaculate Hotels and Suites.
Ime Njem
Ugbo ndi eji eje ozi na Zaria gunyere, ugboala tagzi, ugboala ogba tutm-tum nwere ukwu abuo a na akpo (Rickshaws ma o bu Napep) na ugboala bọs. Obodo a nwere uzo okporo ígwè nke na-eduga na Steeti ndi ozo na Nigeria. mba. Ọ nwere kwara odu ugboelu nke onwe ya.